Nhazi Webu

Tupu anyị amalite iwubere gị akwụ-ozi (web) ọhụrụ, anyị na-agba mbọ̀ ịhụ na anyị leruru ebumnuche gị anya, dịka ihe ị na-eme, ma si na

ya họrọ onyonyoo bụ kpoo wee mebere gị akwụ-ozi (web) ga-adịrị gị mfe iji áká gị lekwa.

Akwụ-ozi (web) anyị mebere na-adị onye ọ bụla lelere ya ḿmā n’ihi na Igbo sị na ahịa ọma na-ere onwe ya. Anyị na-akpachapụrụ ọrụ onye ọ bụla anya, ịhụ na ọ ga-abụ pem ka o siri chọ ya.

Anyị na-agbakwa ḿbọ̀ ịhụ na akwụ-ozi (web) anyị abụghị ọ mara ḿmā n’ugbene, ka ma ọ bụ ugo tozuo ọ chakee. N’ihi ya ka anyị na gị ga-eji kparịta ụka n’isi mbido iji tụnyere gị arò ka ọ ga-esị bara gị uru. Anyị ga na-akpọkwa ugboro ugboro ịhụ na anyị na-eme mmasị gị. I nwekwara ike isi ebe ọ bụla ịnọ wee na-elele ihe anyị na-emebere gị.

Ọrụ anyị akwụsịghị na imebere gị akwụ-ozi (web), anyị ga-egosi gị ka ị ga-esi na-etinye mkpụrụedemede nke gị, tinyekwa onyonyoo ọhụrụ ma ọ bụ gbanwee nke ochie. Anyị na-enyekwara onye ọ bụla anyị rụụrụ orụ aka mgbe ọ bụla o nwere nsogbu.

Anyị na-agbado anya sọnsọ na »

  1. Static Html websites
  2. Content Management System (Joomla)
  3. WordPress as CMS and Blog
  4. osCommerce

Metụrụ anyị ma ihe ị hụrụ masị gị. A na-ekwu ekwu, a na-eme eme.