Mgbasa ozi ụwa

Eleghị anya ị ga-eso chọpụta n’ụwa agbanwela taata site na ngịga-ụwa (internet). E nweziri nkàtá na ọgbakọ n’ụdi dị iche iche na ngịga-ụwa (internet),

dịka Facebook, Twitter dgz.

Ụdịrị ọgbakọ ndị a abụghị sọnsọ maka ịkwalite ọgbakọ ndị mmadụ maọbụ iji akparịta ụka, e ji ha azukwa ahịa n’ụdị pụrụ iche. Iji ya zụ́ọ́ ahịa pụtara na ị ga-eji ya chọta òtù ndị ga-enwe mmasị n’ihe ị na-eme maọbụ ihe ị na-ere.

Echezọkwala na ọ bụghị sọnsọ imepe akụkụ nke gị bụ isi okwu, ihe dịka Facebook nwere ihuakwụkwọ maka ịzụ́ ahịa maọbụ ọgbakọ. Anyị ga-eji njiama gị/unu wee hazie ya ka ọ ga-abụ kpoo na oyoyo.

Ma unu a bụ òtù nzukọ, ị na-àzụ́ ahịa maọbụ ị naghị àzụ́ mana i nwere mmasị iso nwe Youtube, Facebook maọbụ Twitter, metụrụ anyị.