Ebumnuche

Ebumnuche anyị bụ́ imepụta akwụ-ozi (web), ihe obibi na nkàtá ụwa n’ụdị dị iche ma bụrụkwa kpoo na oyoyo.
Nke kacha nke bụ na anyị na-emekwu ihe ndị a niile n’asụsụ Igbo. Anyị na-agba ḿbọ̀ ịhụ na akwụ-ozi (web) anyị nọ n’egwu, bụrụ  sọ ḿmā, na-arụkwa ọrụ ka o siri kwesị ekwesị, ma dịkwa iche.

Ebumnuche anyị n’isi mbido bụ ka imepụta akwụ-ozi (web) maọbụ ihe mbipụta dị ọnụ ala, ime ka onye ọ bụla chọrọ ya nwee ike ịnwe nke ya. Anyị jì n’aka na onye ọ bụla kụụrụ anyị áká maọbụ jụọ ese, agaghị agba áká, ọ ga-enweta ihe ọ chọrọ. Ọ bụ gịnị ka ị na-eche?

Akwụ-ozi ọ bụla anyị meere ndị Igbo na-enwekwa asụsụ Igbo na ya iji na-akwalite asụsụ Igbo ka ọ ghara ịda mmiri. Ndị Igbo ejighị ụjọ eto okorobịa, n’ihi na e jighị ụjọ mụ anyị, ihere agaghịkwanụ eme anyị ime ka ụwa niile mara ụtọ asụsụ Igbo.

Ejikwala ụjọ dara enwe n’elu, egwú atula gị, metụrụ anyị, ka anyị kọwaara gị ka ọrụ anyị sị àgá, ya na obere ihe anyị na-eri.