Maka Anyị

Ex@kt Web Clinic bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe niile gbasara ígwè saịba nọ na ḿbà Germany. Anyị  na-enye aka n’ihe nile gbasara ngịga-ụwa (internet) bido na-imepụta ọmarịcha akwụ-ozi (web) n’olu dị iche iche, ma n’olu Igbo wee ruo na-idozi akwụ-ozi (web) ochie gị ka ọ dịkwa ọhụrụ, ma na-echedokwa ya ka ọ ghara ịghasasị.

Anyị na-ahụkwa maka ihe mbipụta n’ụdi dị iche iche nke bekee na-akpọ ‘printmedia’. Anyị na-emepụta isiakwụkwọ leta (letterhead), akwụkwọ ekele (greeting card), akwụkwọ oku oriri na oñụñụ (invitation card), akwụkwọ ịgbasa ozi (flyer), akaranjiama òtù, ụlọ ọrụ, ọgbakọ, dgz. (logo), ntakịrị akwụkwọnjirimara gị (complimentary card), wdgz.

Anyị na-ahazikwu nkàtá na ọgbakọ n’ụdi dị iche iche na ngịga-ụwa (internet), dịka Facebook, Twitter dgz. Anyị na-eme ya ọ bụrụ gbowaị dị ka ụlọ orụ gị ma ọ bụ ọgbakọ unu siri dị. Ọrụ anyị na-adị ọnụ ala ma bụrụkwanụ kpoo na oyoyo.

Ex@kt Web na-enyere ndị chọrọ ịtapịa asụsụ Japanụ n'olu bekee aka. Anyị nwere ndị asụsụ Japan woro anya nke ọma.

Anyị họọrọ aha anyị bụ ‘Exakt’ maka na anyị na-eme ihe anyị kwuru kpọmkwem dịka anyị na gị siri kpa ya. Anyị adịghị egburu na-achaghị acha maka na ihu dị ḿmā adịghị ḿmā ịtụ ḿbọ́. Anyị anaghịkwa ebido ihe anyị agaghị emechali.