Nnọọ n'akwụ-ozi Ex@kt Web Clinic

Anyị bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe dị iche iche gbasara ígwè saịba nọ na mba Germany.

Anyị na-arụpụta ọmarịcha akwụ-ozi (web) n’olu dị iche iche, ma n’olu Igbo wee ruo na-idozi akwụ-ozi (web) ochie gị maọbụ ichedo ya ka ọ ghara ịghasasị, mekwaa ka ọ na-adị ọhụrụ oge ọ bụla.

Anyị na-ahazikwu nkàtá na ọgbakọ n’ụdị dị iche iche na ngịga-ụwa (internet), dịka Facebook, Twitter dgz. ka ha nwee akaranjirimara nke gị.

Anyị na-eme ụdịrị ihe mbipụta dị iche iche, ịmaatụ, isiakwụkwọ leta (letterhead), akwụkwọ ekele (greeting card), akwụkwọ oku oriri na oñụñụ (invitation card), akwụkwọ ịgbasa ozi (flyer), akaranjiama òtù, ụlọ ọrụ, ọgbakọ, dgz. (logo), ntakịrị akwụkwọnjirimara gị (complimentary card), wdgz.

Metụrụ anyị  ma ọ bụrụ na o nwere ihe ị chọrọ ịmata ka anyị si eme n’ihi na onye ajụjụ anaghị efu ụzọ.