Ihe obibi

Ex@kt Web Clinic na-eme ụdịrị ihe mbipụta dị iche iche, ịmaatụ, isiakwụkwọ leta (letterhead), akwụkwọ ekele (greeting card), akwụkwọ oku oriri na oñụñụ

(invitation card), akwụkwọ ịgbasa ozi (flyer), akaranjiama òtù, ụlọ ọrụ, ọgbakọ, dgz. (logo), ntakịrị akwụkwọnjirimara gị (complimentary card), wdgz. Anyị na-akpachapụrụ ihe mbipụta ndị a anya ịhụ na o nyere ihe ị chọrọ.

Ihe dị ka akaranjiama (logo) òtù, ụlọ ọrụ, ọgbakọ dgz. bụ ihe kwesịrị iji áká nkà mepụta ka ọ bụ maka na ọ na-abụ a hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya, a hụkwanụ ézè, a hụ ngwa agha ya. Anyị na-agbado ụkwụ n’ọkacha mara anyị wee na-emepụta ihe niile gbasara ihe obibi ndị a.

Metụrụ anyị ma ọ bụrụ na o nwere ihe ị chọrọ ịmata ka anyị si eme n’ihi na onye ajụjụ anaghị efu ụzọ. Ụjọ atụla gị n’ihi na a naghị eresị onye ụlọ ọkụkọ ụkwụ jiri.