Nchedo na Ndozi

Ihe ọ bụla áká mere na-emebi emebi ma afọ na-aga. Ihe ọ bụla dịkwa n’ụwa na-àká nka ma chi na-efo. Nke a kpatara na akwụ-ozi (web) gị kwesịrị ka

a na-eneru ya anya ugboro ugboro ka ọ ghara ịghọ ihe ọchịe maka na ọgọdọ kawa nka, ọ kwụba ịyọrịịyọ.

Ọ bụrụ na o teele áká i jiri nwe akwụ-ozi (web) gị, màrá na o ruole oge a ga-àkpá ya áká maọbụ kwanye ya ákwà ọhụrụ ka o soro dị ka ibe ya maka na e mee nwata ka e mere ibe ya, óbì adị ya ḿmā. Ngu onye ji eko akwalahịla ya maka na akwụ-ozi (web) gị bụ ihu ahịa gị ka ọ bụ n’ime ngịga-ụwa (internet).

Ọ bụrụ na ị chọrọ idozi akwụ-ozi (web) ochie gị maọbụ ị gbakwunye ihe ọhụrụ na ya, ọ bụrụkwanụ sọnsọ ka anyị na-echekwabara gị ya, metụrụ anyị ka anyị kọwara gị ka o siri dị.

Taata bụ gboo maka na e mee ngwa ngwa, emeghara ọdachị.