Ọrụ Anyị

N’ụlọ ọrụ anyị bụ Exakt Web Clinic, anyị na-emepụta otụtụ ihe gbasara igwe saịba.

Dịka anyị siri kọwaa ebumnuche anyị, anyị na-agba ḿbọ̀ ihụ na ọrụ anyị na-adị ọnụ ala na-agbanyeghị na ọ na-abụ sọ ḿmā, ma nyekwa ihe a chọrọ n’ụdị ọ bụla.

Anyị na-emepụtakwa ọkpọka akwụ-ozi (web) n’asụsụ Igbo n’ụdị ọ ga-esi me gị obi ụtọ. Hapụrụ anyị ihe edemede ma ọ bụrụ na i nweghị ohere ide ya, anyị ga-eleba ya anya ma dekwaara gị ya n’ụdị ọ ga-esi masị gị maka na ọ bụ áká mere ázụ́ ọ gbaa nkụrụnkụ.

Anyị na-ebepụrụ Ndị òtù maọbụ Ogbakọ ndị Igbo n’ụwa gburugburu ego.

 
Ọkara mara anyị bụ »

  • imebe ọkpọka na ọmarịrma akwụ-ozi (web) n’olu di iche iche.
  • imebe ihe mbipụta bụ kpoo na oyoyo.
  • ịhazi nkàtá na ọgbakọ na ngịga-ụwa (internet), dịka Facebook na Twitter dgz.
  • imezi maọbụ ichedo akwụ-ozi (web) ochie gị.
  • ịhọtara gị ezigbo ụlọ hostin nke dị ọnụ ala ma dịkwa ḿmā.

Metụrụ anyị ma ihe ị hụrụ masị gị. A na-ekwu ekwu, a na-eme eme.