Igbogaadi

Ebumnuche Igbogaadị bụ dịka aha ya siri dị, ka Igbo ghara ịda mmiri ma

dịkwara anyị ọkpụtọrọkpụ. Ọ bụ maka iso kwalite asụsụ ọma na omenala Igbo ka e jiri mụpụta ya. Igbogaadị bụ ebe anyị ga na-atụgharị uche n’ụdị dị iche iche site na-ịkparịta ụka, ya na itulegasị mkpụrụokwu Igbo. Sitekwa na-ịjikọ aka ọnụ wee na-atule ha ka anyị ga-eji nye aka iso chọtagasị mkpụrụokwu ndị ahụ anyị chere na ha furu efu ma ọ bụ ịmụpụta na ịchọpụtakwa ndị ọhụrụ maka na ọ bụ chi na-efo, ọkụkọ a na-enwe dị.